Full Lyrics
REFRAIN
Ekene O! Ekene
O! Ekene O! Ekene diri Chukwu!
O! Chai! Odogwu akataaka n'I bu Onyenmeri! Ekene Chukwu!
VERSE 1
Ihem ji n'eto Gi, Chineke mo, Omenma.
Ihem ji aja Gi nma, Okak'igwe, Chi mar'obi mo, bu na ngozi Gi
n'ebem no erika, Omam'amasi amasi!
Amara Gi n'ebem no bar'uba.
Ekene diri Chukwu.
VERSE 2
N'okpor'uzo nile, I n'edu mo, I n'azo mo.
M fee n'elu, m gaa n'ala, m gbaa n'etiti mmiri.
Ngozi Gi, Chineke, no n'ahu mo, O n'echekwaba mo.
Amara Gi, Chineke, kam ji a ga.
Ekene diri Chukwu.
VERSE 3
Nwa bu onyinye Chukwu.
Nwa bu onyinye mara nma.
Nwa nwoke, nwa nwanyi, bu ngozi Chukwu si n'igwe.
Nwa akona mo! Nna! Agada gbachir'uzo nuru nuo!
Omumu akona mo! Ikem kwo a ba!
Ekene diri Chukwu.