Full Lyrics
INTRO
Ekene O! Ekene O!
Dike na dimkpa, Ikuku ama n'oya,
Dike n'agha, Odogwu akataaka n'ibu Onyenmeri,
Odogwu akataaka, Onyenmeri.
CHORUS
Ekene diri Chukwu!
Ekene diri Chukwu!
VERSE 1
Ihe m ji n'eto Gị, Chineke mo, Omenma
Ihe m ji aja Gị nma, Ọkakọgwu, Chi mo.
Omenma, ngozi Gị n'ebem nọ erika,
Ọmama masị amasị!
Amara Gị n'ebem nọ baruba. O!
Ekene diri Chukwu.
VERSE 2
N'okporo ụzọ nile I n'edu mo, Nnazo mo.
M fee n'elu m gaa n'ala
M gbaa n'etiti mmiri
Ngozi Gị, Chineke n'enahụ mo,
Onyechekwaba mo
Amara Gị, Chineke, kam ji aja O!
Ekene diri Chukwu.
VERSE 3
Nwa bụ onyinye Chukwu
Nwa bụ onyinye mara mma,
Nwa nwoke, nwa nwanyị
Bụ ngozi Chukwu si n'igwe
Nwakọnwa mo Nna!
Agada gbachirụzọ nụrụ nwo! O
Ọmụmụ akọna mo! Ikem kwụaba! O!
Ekene diri Chukwu.
KAM SI YỌỌ CHUKWU
Omewo Ya
Omewo Ya
Omewo Ya
Kam si yọọ Nna Eh!