DEEJE, DAALU. by Eze Chris — Lyrics

Eze Chris Igbo Offertory Hymns Celebrations Hymns Wedding Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Ihe Chukwu mere mo n'eluwa erika. Ọrụọma Ọ n'arụrụ mo n'eluwa karịr'akarị. Ije nw'ebune bu chi ya nyere ya, Chi n'agọzi mo, ya kam jiasi Chineke daalu. CHORUS Daalu Chineke, ọrụaka Gị mara mma na ndụ mo. Daalu Nna, Okaka onye yiri Gị n'ime mma? Onye kam g'eji tunyere Gị n'imelu maka ndụ nk'I nyerem, ego, n'ahụ ike nk'I nyerem, ọgụg'imma. Deeje o, deeje onye si, n'akụn'ụba, ihe nile'I ji chọọ mụ mma n'ụwa. Mkọb'ih'I n'emere mo chi g'eji, chi g'abọ. Mkọb'etu'I si agọzi mo chi g'eji, chi g'abọ. Onye dika Gị, Chukwu? Deeje daalu. VERSE 2 Eziokwu, nanị ukwu gbar'apịtị n'eri ihe soro ya. Site na mbọ anyị n'agba k'anyị si'eriju'afọ. Mana, mkpat'adịghị apkatach'akụ, nrich'adịghị erichakw'akụ. Ọbụghị n'ike'aka mmadụ k'iheọma si'abịara ya, ọ si na Chi, Chi mara mkpa mo, deeje, daalu. VERSE 3 Onye ji ya rur'ụzọ'abụọ ya gwurucha ma kele Chi ya. Ọdịghị mma ike'oke ji n'azụ'ọba. Chukwu gọzie gị kele Ya, atụl'egwu, kele Ya, makan'etoo dike na nk'omere'omekw'ọzọ.

Download the sheet music

DEEJE, DAALU.

DEEJE, DAALU.

By Eze Chris
Staff & Solfa
Igbo
8 pages
1 Downloads
Offertory Hymns Celebrations Hymns Wedding Hymns
0 0

More lyrics you may want