EZI CHUKWU NARA AJA ANYI by Obieli Udoka — Lyrics

Obieli Udoka Igbo Consecration Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Anyị arịọ Gị, nara aja anyị, Ezi Chukwu, Ezi Chukwu nabata ya, were ya, gozie ya, Mekwaa ya Nna, k'ọ dị mma kwesị n'ị gaanara ya. VERSE 1 Mgbe anyị naehunyere Gị aja obi ọma anyị nke bụ ihe ala mịpụtara Ọ bụghị nkwụghachi Ịhụnanya Gị anyị enweghị ike ya. VERSE 2 Mgb'ọbụlat'anyị bụ ụmụ Gị gbakọrọ n'ihu Gị, ịchụrụ Gị aja kachasị nsọ; Anyị n'erunye ya maka ndị mmadụ niile ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. VERSE 3 Sọ Gị bụ ndụ ndị kwere na Gị ndụ ihe niile n'ụwa ma nke eluigwe; gosi anyị ụzọ nke kamma iji wee gosi Gị aṅụrị anyị na Gị. VERSE 4 Ndị nsọ n'eji ukwe aṅụrị eso afọma Gị n'eto kw'ike Gị; Kwere k'anyị soro ha too Gị oge niile site n'aja anyị. VERSE 5 Gozie anyị, gozie anyị, gozie O Chukwu anyị ndị naachụrụ Gị aja; nara anyị, nara anyị, nara O Chukwu anyị aja nke onwe anyị.

Download the sheet music

EZI CHUKWU NARA AJA ANYI

EZI CHUKWU NARA AJA ANYI

By Obieli Udoka
Solfa
Igbo
2 pages
29 Downloads
Consecration Offertory Hymns Hymns
1 0

More lyrics you may want