Full Lyrics
REFRAIN
Bata Dinwenu. Jesu, bata n'ime ndụ m o.
Ọkaaka, Chineke m o, n'enye ndụ, bata n'ime m o.
Jesu Kristi, ezi Dinwenu, biri n'ime m o.
VERSE 1
Sọ Gị bụ Chukwu. Sọ Gị n'enye m ndụ.
Achịcha si n'igwe, Jesu Kristi, bata n'ime m o.
Jesu nọ na Eucharistia, biri n'ime m o.
VERSE 2
Sọ Gị n'asacha njọ. Sọ Gị n'edo anyị nsọ.
Ọbara Jesu, isiyi nke ndụ, bata n'ime m o.
Jesu nọ na Eucharistia, biri n'ime m o.
VERSE 3
Bata bur'eze! Chịba n'ime ndụ m o!
Eze k'eze niile, Chineke, bata n'ime m o.
Jesu nọ na Eucharistia, biri n'ime m o.