Full Lyrics
REFRAIN
Anyị kwere na anyị emehiewo gị,
anyị anabatago na anyị bụ ndị omenjọ.
Anyị wee naarịọzị ebere maka njọ anyị Chineke.
Biko, gbaghara.
VERSE 1 (SOPRANO)
N'eziokwu, ndị njọ k'anyị bụ.
N'ime njọ ka amụrụ anyị,
n'ime njọ ka atụrụ ime anyị.
Mee ebere Chukwu, gbaghara.
VERSE 2 (TENOR)
Achụpụkwala anyị n'ihu gị,
anapụkwala anyị mmụọ gị dị asọ.
Kama n'obi ebere gị, gbaghara.
VERSE 3
Wer' amara gị sachapụ anyị njọ Chukwu biko.
Gbanwoonụ anyị k'anyị dịrị k'i si chọọ,
k'anyị mewezie ihe ị naachọ.