Full Lyrics
[Chorus]
K'anyị kele Chineke n'ihi afọma ya erika,
K'anyị kele ya n'ihe ọma Ọ naemere anyị.
Chukwuebuka, Chukwuebuka,
Ngozi ya eh karịrịa karị.
[Verse 1]
Anam asị gị Nna imela.
Neenu ka ngozi Chineke si baaram ụba,
Negodụ ka ebube ya siri jum ahụ.
Bịanụ soro m k'anyị nye Chukwu ekele,
Maka ekele dike na nke o mere, o mekwa ọzọ.
[Verse 2]
Ekele dịrị Chineke, otito
Dịrị ebube dike maka ihe ọma nke ọ naeme.
Ọnụm apụghị ịkọcha ya.
Ọ bụ akụnụba, ọnụm apụghị ịkọcha ya.
K'ọ bụ ndụ nke o nyere m o, ọnụm apụghị ịkọcha ya.
Ọ bụ ahụ ike, ọnụm apụghị ịkọcha ya.
K'ọ bụ ọgụgụ isi ka Chineke jiri wee chọọ m mma,
Maka ngụkọba ya, chi gaeji chi gaa bọọ.
[Verse 3]
Chukwuebuka, Chukwuebuka.
Were ihe dimma bịa nyenụ Chineke.
Were ịgba, udu, ekwe, ogene tibere ya egwu.
Jabanụ ya mma n'ihi na Chukwu anyị ebuka.