Full Lyrics
[INTRO]
Chukwu anyị ekele Gị
Onye nwe anyị ri b'otito
I b'Ime re anyị ba r'uba eb
Nara ekele anyị o Chukwu ọma.
eb! Bịanụ k'anyị tobe Odogwu eze kasị akasị
Amana maiamasị Dike mgbadike
lorie lorie lorie nyi ọkaka
Ub eb Chukwu nk'igwe nala daalụ o
[VERSE 1]
Nn'anyị nọ n'elu igwe
Onye kere ihe niile biko
Nn'anyị nọ n'elu igwe
Were obi ọma lekwasịa ny'anya
Ma nara ekele anyị
Anyị ji abụ otito n'ekele
Were bịa n'iru Gị
Ma ka n'Ịdịmma m'ebere Gị na dị gịde ebighebi
Anyị kọba mmeso ọma Gị
Chi ga eji chi gaa bọ ekele
[CHORUS]
Sini meo, bịanyị pụta k'anyị n'enye Gị
Chukwu nara ekele anyị
Dinwenu ri b'otito
Ib'Ime re anyị ba r'uba
Ngọzi dịrị Gị o
Anyị ji obi aṅụrị wee kele Gị
Ngọzi dịrị Gị.
Obi dị anyị ụtọ iyo yo yo yo
Anyị na ja Gị mma
Olisa binigwe
Nara ekele na r'otito
Nara mbuli elu
Naanị b'ị kwesịrị ba n'ihi n'Ịdịmma
Chukwu ọma eb mma Chukwu ma.
[VERSE 2]
Ma ka onyinye kpara Nwa Gị bụ Jesu Kristi
Dinwenu anyị ekele Gị ma ja Gị mma
Nke nzukọ Gị dị asọ na Chukwu nk'Ị nyere anyị
Nke ndụ, a bụ ike, ezi n'ụlọ na ndị enyi
Maka Amara na Ngọzi nk'Ịnyere anyị
Dinwenu anyị ekele Gị ma ja Gị mma
Kedu k'anyị g'esi kwụọ ụgwọ ọma Gị Dinwenu
Onwe ihe anyị ga eweta ga ezu inye Gị ekenu
Ma ka ihe ọma niile Ị na mere anyị?
Onwe ihe anyị ga eweta ga ezu inye Gị ekenu
Ma ihe niile anyị nwere ọbụ Gị nyere anyị
Ma ụmụ ụwa n'ibe niile dị n'ime ya bụ nke Gị o Chukwu ọma.
[VERSE 3]
Odogwu Odogwu akataka daalụ daalụ
Odogwu anyị na eto aha Gị ruo mgbe niile ebighebi.
Odogwu Odogwu akataka daalụ daalụ
Odogwu anyị na eto aha Gị ruo mgbe niile ebighebi.
Ike niile, Nsọpụrụ niile, Ngọzi niile dịrị Chukwu anyị ebighebi
Otito anyị ji bịa inye Gị
Ihe kwesịrị Gị bụ abụ Otito na ekele biko nara ba
Ọbụlagọdị otu puku ire ezughị ikwuputa o
dịrị Chukwu anyị ebighebi.
Ike niile, Nsọpụrụ niile, Ngọzi niile dịrị Chukwu anyị ebighebi.
Odogwu Odogwu akataka daalụ daalụ
Odogwu anyị na eto aha Gị ruo mgbe niile ebighebi.
Otito Gị Mana anyị ga n'ekwikwe n'agbegwu
ma n'enwe obi aṅụrị ebighebi.
Aiye ye o o. aiye ye o
Anyị ji obi aṅụrị n'etoo Gị Chukwu ọma eb
aiye ye o oweo o
aiye ye owe aiye ye o
Anyị ji obi aṅụrị we'ekele Gị Chukwu ọma.