Full Lyrics
INTRO
Ndị mmụọ ọma siri n'eligwe gbadata n'ụwa mgbe a mụrụ Dinwenu.
Onye nzọpụta,
Onye nzọpụta,
Onye nzọpụta ụwa niile abịago;
Aha ya bụ Immanuel.
CHORUS
K'anyị kelee nụ Chukwu;
Ebube Dike abịago n'ụwa,
K'anyị kelee nụ Chukwu.
Onye n'enye ndụ abịago,
Onye n'enye ndụ abịago.
VERSE 1
Chukwu n'ụwa,
Lọ anụ n'ezie o nyere anyị onye nzọpụta.
Onye nzọpụta anyị abịago,
Onye n'enye ndụ abịago,
Onye n'enye ndụ abịago.
VERSE 2
Na Bethlehem n'obodo Judea,
Ebe a mụrụ Jesu nwa k'anwa;
Eligwe n'ụwa n'enwe aṅụrị,
Onye n'enye ndụ abịago,
Onye n'enye ndụ abịago.
VERSE 3
Otito dịrị Onye nzọpụta Onye nwe anyị,
Nnukwu ebube dịrị gị, O Maria,
Onye mụtara anyị Onye nzọpụta;
Onye n'enye ndụ abịago,
Onye n'enye ndụ abịago.