CHIZITEREM IHE OMA by Faustinus C. Oguamanam — Lyrics

Faustinus C. Oguamanam Igbo Offertory Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Ekelem Gị Chukwu Nnam o omemma Ọkaka maka ihe ọma I n'emere m o obi asọgbue m o. Kedu kam si akwụ Gị ụgwọ maka ihe ọma I mere m o, mgbem n'enweghị olileanya Chi zitere m o iheọma. [VERSE 1] M kọwa ịdịmma Chineke n'ime ndụm chi g'eji chi g'abọ I ma n'ọnweghị nkọcha but' onyinye dimma gbar' abụba k'anyị bujere Chineke. [VERSE 2] Iheọma niile Chim zitere m o ọnụm apụghị ịgụtọnụ Chine gborom mkpa m o. Kedu onyinye m g'eji bịa n'ihu Gị I kele Gị Chukwu aga m'aja Gị mma n'ihi n'osi n'obim pụta. [VERSE 3] Butenu ngwa egwu dimma k'anyị kuoro Chineke egwu ony' ọbụla butenu ekwe bute udu na mkpọtọmkpọ n'ọyọ k'anyị kuoro Chineke egwu dimma.

Download the sheet music

CHIZITEREM IHE OMA

CHIZITEREM IHE OMA

By Faustinus C. Oguamanam
Staff & Solfa
Igbo
6 pages
1 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want