Full Lyrics
[REFRAIN]
Ekelem Gị Chukwu Nnam o omemma
Ọkaka maka ihe ọma I n'emere m o obi asọgbue m o.
Kedu kam si akwụ Gị ụgwọ maka ihe ọma I mere m o,
mgbem n'enweghị olileanya Chi zitere m o iheọma.
[VERSE 1]
M kọwa ịdịmma Chineke n'ime ndụm
chi g'eji chi g'abọ I ma n'ọnweghị nkọcha
but' onyinye dimma gbar' abụba k'anyị bujere Chineke.
[VERSE 2]
Iheọma niile Chim zitere m o
ọnụm apụghị ịgụtọnụ Chine gborom mkpa m o.
Kedu onyinye m g'eji bịa n'ihu Gị I kele Gị Chukwu
aga m'aja Gị mma n'ihi n'osi n'obim pụta.
[VERSE 3]
Butenu ngwa egwu dimma k'anyị kuoro Chineke egwu
ony' ọbụla butenu ekwe bute udu na mkpọtọmkpọ n'ọyọ
k'anyị kuoro Chineke egwu dimma.