CHINEMEREM by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Ọ n'emere m nma, Ọ n'emere m nma nma, Kedi'he m g'enye ezi Nna m o Ony'obi ọma. Aga m aja Ya nma, Aga m atụrụ Ya nma nma, ihe Chi n'emere m o Ọnụ m apụghị ịkọchasi. [VERSE 1] Ị n'ajụ m Onye nyere mu ndụ m o, ndụ nk'ị dị Onye nyere gị. Ị n'ajụ m Onye nyere mu ahụike, Onye nyere gị ahụike nk'ị nwere ee eh. [VERSE 2] Ị n'eje ejee n'abata, Ọ bụ onye n'echebe gị n'ihe mberede? N'ọnya nile nke ekwensu n'agba, Ọ bụ Onye n'echebe gị n'ihe mberede? eh. [VERSE 3] Ọ bụ Onye kere anyanwụ na ọnwa, ma kee kpakpando nile dị n'eligwe. Ọ nyere mmadụ echiche na ihe nile n'uju, Nwannem so mu kele Chineke; Chi m o n'emere m ih'ọma.

Download the sheet music

CHINEMEREM

CHINEMEREM

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
2 pages
62 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want