CHINEKE ONYEOMA by Aloy Zuruibe — Lyrics

Aloy Zuruibe Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Mma mma e, mma mma e, mma mma e, Mma mma mma mma e, Kele Chineke jaa ya mma. Ekele ị dị mma e, Onye ker'ụwa onyeoma, Onyeoma. VERSE 1 Soro nụ m tobe ya, tobe nụ Chineke. Ekele dịrị gị, ị meela. VERSE 2 K'anyị jaa ya mma, bunye y'onyinye. Anyị ekele gị, Nna ị meela. VERSE 3 Anyị gaeji gịnị kele gị, Eze bube k'ị bụ. Otito na nsọpụrụ dịrị gị, Eze daalụ. VERSE 4 Ịhụnanya Chineke, ka rịrịa ka rị o. Olisa ebulụwa Chineke, daalụ ị meka. VERSE 5 Nara onyinye ụmụ gị n'enye gị. Nara aja anyị n'achụnyere gị. VERSE 6 Nara onyinye nwa anyị ajado, k'anyị n'ebunye gị. Nara ya, magozie kw'anyị.

Download the sheet music

CHINEKE ONYEOMA

CHINEKE ONYEOMA

By Aloy Zuruibe
Solfa
Igbo
1 page
37 Downloads
Offertory Hymns Hymns
1 0

More lyrics you may want