Full Lyrics
REFRAIN
Mma mma e, mma mma e, mma mma e,
Mma mma mma mma e,
Kele Chineke jaa ya mma.
Ekele ị dị mma e,
Onye ker'ụwa onyeoma,
Onyeoma.
VERSE 1
Soro nụ m tobe ya, tobe nụ Chineke.
Ekele dịrị gị, ị meela.
VERSE 2
K'anyị jaa ya mma, bunye y'onyinye.
Anyị ekele gị, Nna ị meela.
VERSE 3
Anyị gaeji gịnị kele gị, Eze bube k'ị bụ.
Otito na nsọpụrụ dịrị gị, Eze daalụ.
VERSE 4
Ịhụnanya Chineke, ka rịrịa ka rị o.
Olisa ebulụwa Chineke, daalụ ị meka.
VERSE 5
Nara onyinye ụmụ gị n'enye gị.
Nara aja anyị n'achụnyere gị.
VERSE 6
Nara onyinye nwa anyị ajado, k'anyị n'ebunye gị.
Nara ya, magozie kw'anyị.