Full Lyrics
[A Duet Intro]
Chukwu onye ka n'igwe
Oche ya dị n'igwe, Chukwu onye k'ihe niile
Onye k'ihe niile n'ara otito
Kwesịrị Gị bịa nụrụ na ra mbu lie lu Nna guzie Okike gị
Onye dị ka Gị
[REFRAIN TUTTI]
Kwerenụ Dinwenu ukwe ọhụrụ
Kwerenụ Dinwenu Chineke ukwe ọhụrụ kwe go
Aha ya dị nsọ
Kwebukwanụ rị wepụt' obi Gị ọlụọma ee n'enye ligo
Nụrebanụ na Chineke anyị bụ Odogwu!
Odogwu n'agha
Kpọpụta ebube ya na mba niile
Kwupụta ihe obube ya n'obodo niile
Oziọma nke nzọpụta na mba niile ụbọchị niile
Gwanụ mba niile ta mba obodo niile
Na Chukwu bụ ka ebube Chineke oge niile ụbọchị niile Chi niile
Anyị g'atụ G'egwu, karịcha Chi niile
Chineke nk'igwe n'ala
Sọ Gị bụ Chineke Chi ka Chi niile.
Chukwu okike, Okike Gị g'erubere Gị sọ.
Ihe niile dị n'ụwa ha bụ ọrụ aka Gị.
Ọnwa na kpakpando sakwu n'ọrụ aka Gị.
Anyanwụ n'etiku ku ọ bụ onye kere ha?
Egbe el'igwe ya na amụmà ọrụ aka Gị
Azụ k'ị na mmiri ha bụ nke Gị
Anụmanụ bi n'ọhịa nke Gị ka ha bụ.
Chineke nke igwe n'ala.
Chineke Chineke m o Chukwu ọma
Chineke Nna nke igwe n'ala
Chineke bụ dike! K'anyị jaa ya mma.
K'anyị jaa ya mma. Ọ bụ Odogwu!
[Verse 2 option?]
Eb'ụwa g'asọpụr' Aha ya
Ebube Dike! Ngozi n'adịrị Chineke Nna
Ọ kaka Nna, k'anyị jaa ya mma
Chineke bụ Ekwueme
Anyị g'ajaa ya mma.
Ihe unyi Chukwu Eb'ụwa g'asọpụr' Aha ya
Ebube Dike! Ngozi n'adịrị Chineke Nna Chukwu
Ebube Dike! Ngozi n'adịrị Chineke Nna Ọ kaka
Nna, k'anyị jaa ya mma
[Soprano Solo]
Bịa nụ k'anyị jaa ya mma
K'anyị bunye y'otito
K'anyị nye Chineke ekele Eze dị mma
K'anyị bunye y'otito
K'anyị nye Chineke ekele Eze dị mma
K'anyị jaa ya mma
Ụmụ mmadụ ndị bi n'ụwa jaa ya mma biko kelenụ Chukwu
Bunye y'otito Chineke Nna nk'eligwe
Ọ mara mma k'anyị jaa ya mma
Ọ bụ ya kere Gị jaa ya mma.
Ọ n'echekwaba Gị bunye y'otito maka n'ọdị mma,
Ngwanụ k'anyị nye Chineke Nna ekele nke kwesịrị ya, jaa ya mma.
Abụ ukwe k'anyị jiri bịa K'anyị jaa ya mma,
Abụ dị ụtọ n'adị Gị mma, Onye Nsọ. O!
Chineke Chineke dị mma
Agam' ekwukw' otito Gị n'ịdị mma,
Chineke ker' ụwa, ware bunye G'otito Chineke ekele
Eze dị mma k'anyị jaa ya mma
[Lento et vivace]
Otito dịrị Nna, Otito dịrị Nwa, Otito dịrị Mmụọ Nsọ
Nna ya na Nwa ee Otito dịrị Mmụọ Nsọ
Otito Otito Otito, Otito Obito dịrị Nsọ
Ebe ọ dị n'izizi Ọ g'adị gide
Ebe ọ dị k'ọ g'adị gide
Ebe ọ dị n'ambu, Ọ g'adị gide
Atọ n'otu ebe ọ dị n'izizi
Ruo mgbe ebighị ebi ebe ọ dị n'izizi
Mgbe niile ebighị ebi ebe ọ dị n'izizi
Ọ g'adị gideruo mgbe ebighị ebi
Ọ g'adị gideruo mgbe niile mgbe ebighị ebi, ma na nụ
[Piu mosso]
Chineke bụ Dike! K'anyị jaa ya mma!
K'anyị jaa ya mma! Ọ bụ Odogwu!
El'ụwa g'asọpụr' Aha ya
Ngozi n'adịrị Chineke Ọ kaka,
K'anyị jaa ya mma Chineke bụ Ekwueme
Nna Chukwu K'anyị jaa ya mma
Ọ kaka Nna, k'anyị jaa ya mma
Anyị g'ajaa ya mma.
El'ụwa g'asọpụr' Aha ya
Ngozi n'adịrị Chineke Ọ kaka
Ebube Dike! Ngozi n'adịrị Chineke Nna, Chukwu
Ebube Dike! Ngozi n'adịrị Chineke Ọ kaka
K'anyị jaa ya mma
Nna, k'anyị jaa ya mma Ebube Dike ya
Ngozi n'adịrị Chineke Ngozi dịrị ya K'anyị jaa ya mma
Ngozi n'adịrị Chineke Ọ kaka, K'anyị jaa ya mma
Ngozi n'adịrị Chineke Nna, Chukwu, K'anyị jaa ya mma
Ngozi n'adịrị Chineku Ọ kaka Nna, k'anyị jaa ya mma