CHI M SI M DIRI by ADAWAI JAMES — Lyrics

ADAWAI JAMES Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Eh Chi m si m dịrị n'ezie ri Chi m si m dịrị ndụ taa ya ka m ji bịa Ka m kele Ya Chi nyere m ndụ Chi m si m dịrị Chi m si m dịrị Ya ndụ ya ka m ji bịa Chi nyere m ndụ ma were amara Ya kponyere m aka Nna ebe ị si m dị m o, aga m ejere gị ozi Gị ozi n'ụwa. [VERSE 1] Ekele dịrị Chi m o Chi mere ka ndụ fọrọ m o Echetara mgbe m nọ n'ọrịa Chineke gbatar'ọsọ si m dịrị Nara m ekele oh n'otito Eh ọkaka m o, ebe ị si m dịrị m o Nara m onyinye, onyinye bu r'ibu Ka m g'enye Chi m. [VERSE 2] Ekele dịrị Chi m o Chi nekweghị ka m man'ọnya nya Otito dịrị eh Chineke onye dọpụtara m o Ka m ji bịa ekele oh n'otito Nara m ekele oh n'otito Eh ọkaka m o, ebe ị si m dịrị m o Nara m onyinye, onyinye bu r'ibu Ka m g'enye Chi m. [VERSE 3] Lee jerem lota Lee m o ukwu akpọghị m o Otito dịrị eh Chineke onye nyere m ije a wele Ebe Chi m si m dịrị K'anyị je nye y'ekele B'o nyere m ndụ nyekwa m ahụ ike K'ai je kele ya Ebe ị dị ndụ taa ebe ị nwere ume ndụ Ọ bụghị n'ike akagị k'anyị je nye y'ekele Aga m eji iken'n nwere bịa nye y'ekele Nara m ekele oh n'otito Eh ọkaka m o, ebe ị si m dịrị m o Nara m onyinye, onyinye bu r'ibu Ka m g'enye Chi m.

Download the sheet music

CHI M SI M DIRI

CHI M SI M DIRI

By ADAWAI JAMES
Solfa
Igbo
3 pages
1 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want