Full Lyrics
[Verse 1]
Ezi Chineke Nna onye ebere nara ekele m o, Chim lee.
[Refrain]
O Nna doo, nara ekele m o.
[Verse 2]
Onye bi n'oma si n'eligwe bia nara ekele m o, Odogwu.
[Verse 3]
Ututu oma, ehihie oma, anyasi oma, k'i n'enya anyi aghalu.
[Verse 4]
Odighi onye yiri gi Nna n'enu uwa, ka n'eligwe.
[Chorus]
O b'olocha k'o b'oledo k'a m g'eji kele gi? O Nna yanum o.
O dimma n'ememma, alleluia doo, mana chi g'eji eji.
Nyewe m n'gi otito oriri, m'nai k'ega gwum agwucha, Chim ar'obim o.
O Nna doo, nara ekele m o.
[Verse 5]
O bu n'nke n'agbu agbu, k'o bu n'anya g'eju afo.
[Verse 6]
Isi iyi nke ndu m o, bia nara m onyinye m e.
[Verse 7]
Ume m n'eku, Chim oma, gwa m ihe m g'enye gi.
[Verse 8]
Arusia gaghi eri ihe m nwere o, so Chimu k'a m g'enye ya.
[Verse 9]
O Nna, yanum o, werem o, werem Nna,
para m Nna, kuru m Nna, jidem Nna, jidem jide,
m o, ezi Nna, jisie m ike, enye m gi onwe m o, Chim lee.