Full Lyrics
[CHORUS]
Chideraa, ọ dego ihe Chukwu kwuru ọ kwuwo ya, ụzọ Chukwu.
Mepee r'onye g'emechi? Nke chi mechiri onye g'emepe? Ọmazugo ya,
agam atụrụ ya mmamma abụọ tito kam sie bunye Chineke m o.
Ngwanụ kụbanụ egwu, ogene gbubenu opi kụbanụ,
ekwe werenụ abụ otito tob'Olisa, onye njọzi.
Chimar'obim o, n kọb'o rue ebube gị na mmeso ọma gị e,
chi g'eji ọ gabo. Ony'amara, onye ngọzi,
Chukwu ebube, Ony'ukwu, nar'ekele m o, ih'i dere emezugo.
[VERSE 1]
N'asọtụ ụwa niile, ihe i mere n'ede.
Jim jim jim jim n'obodo niile, n'amba niile, ị bụ dike n'agha.
Nna ndụ m o, Ọ kwasi n'achi eze, ih'i kwuru k'ag'eme,
uche Chukwu kam g'eme. Chukwu biko naranụ abụ n'ekele m jiri bịa Nna. I mewo nkw'i kwere m, ih'i dere emezu m o.
[VERSE 2]
Onye jụla m'ọnụ, ọ bịadigo mụ mma.
Chukwu echetago m o, O mewo nkw'o kwere m, oge Chukwu ka
mma oye, Chineke kacha mma n'el'ụwa, achụl'ụwa n'ike ihe chi
dere g'emezurịrị.