CHIDERAA by Kelvin Chinonso Anozie — Lyrics

Kelvin Chinonso Anozie Igbo Offertory Hymns Celebrations Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Chideraa, ọ dego ihe Chukwu kwuru ọ kwuwo ya, ụzọ Chukwu. Mepee r'onye g'emechi? Nke chi mechiri onye g'emepe? Ọmazugo ya, agam atụrụ ya mmamma abụọ tito kam sie bunye Chineke m o. Ngwanụ kụbanụ egwu, ogene gbubenu opi kụbanụ, ekwe werenụ abụ otito tob'Olisa, onye njọzi. Chimar'obim o, n kọb'o rue ebube gị na mmeso ọma gị e, chi g'eji ọ gabo. Ony'amara, onye ngọzi, Chukwu ebube, Ony'ukwu, nar'ekele m o, ih'i dere emezugo. [VERSE 1] N'asọtụ ụwa niile, ihe i mere n'ede. Jim jim jim jim n'obodo niile, n'amba niile, ị bụ dike n'agha. Nna ndụ m o, Ọ kwasi n'achi eze, ih'i kwuru k'ag'eme, uche Chukwu kam g'eme. Chukwu biko naranụ abụ n'ekele m jiri bịa Nna. I mewo nkw'i kwere m, ih'i dere emezu m o. [VERSE 2] Onye jụla m'ọnụ, ọ bịadigo mụ mma. Chukwu echetago m o, O mewo nkw'o kwere m, oge Chukwu ka mma oye, Chineke kacha mma n'el'ụwa, achụl'ụwa n'ike ihe chi dere g'emezurịrị.

Download the sheet music

CHIDERAA

CHIDERAA

By Kelvin Chinonso Anozie
Solfa
Igbo
3 pages
2 Downloads
Offertory Hymns Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want