Full Lyrics
VERSE 1
Bute onyinye gị bịa bunye Chukwu Nna,
Onye kere gị, lete gị, nye gị ha n'efu.
REFRAIN
Bute onyinye gị n'ihu Chukwu,
N'Ọ gaanara n'ebe isi weta.
VERSE 2
Bịa bịa o bịa kele Chukwu Nna,
Onye nyere gị akụ n'ụba, nye nwa gị obi ụtọ.
VERSE 3
Chukwu Nna biko, nara onyinye nwa a,
Gozie ha nile ma meekwa ka ha dị ọcha o.
VERSE 4
Ezi enyi m eh, kedu ihe i ji ewe iwe,
Mesaa ihu gị ka Chukwu nara onyinye gị.
VERSE 5
Anyị gaeji egwu n'ukwe kele Chukwu Nna,
Kele Ya n'ihi n'Ọ bụ Onye mma mma.
VERSE 6
Gozie, gozie anyị, gozie, gozie anyị,
Anyị ji obi ọcha n'obiọma but' onyinye anyị.