BATANU N'ULO CHUKWU by NRSC 2015 — Lyrics

NRSC 2015 Igbo Entrance songs Hymns Offertory Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Bianu n'ime ulo k'anyi jee Ngwanu k'anyi jee n'ulo nke Chineke Maka n'o bu Onyeoma Maka n'o bu Onyeokwu REFRAIN Bianu k'anyi jee kelee Ya Gozie aha Ya kpooro Ya isiala N'ulo nso Ya di ebube n'ime Aja Missa dinso. VERSE 1 K'anyi jeenu kelee Dinwenuanyi Jeeso Kristi kelee Ya n'Omaka n'o ji r'onwe Ya chu aja n'elu obe na Kalvary Kristi bu Onye nchuaja buru kw'ihe e ji achu aja Ka n'elu obe ka n'elu ota k'anyi fee Ya n'okwesiri dinso. VERSE 2 K'anyi wero obi diocha chunyere Chineke aja dinso Aja ahu n'Obara Kristi no n'ota n'ime udi achicha na mmanya nke e hunyere Chukwu Maka ndi di ndu na ndi nwurua nwii. VERSE 3 O n'ato m obi ibata n'ulo nso Gi Onyenweanyi O n'ato m obi ibata n'ulo nso Gi maka n'o Otu ubochi ka mma na be Gi, o ka mma karia nnukwuru nnu afo n'ebe ozo.

Download the sheet music

BATANU N'ULO CHUKWU

BATANU N'ULO CHUKWU

By NRSC 2015
Solfa
Igbo
3 pages
5 Downloads
Entrance songs Hymns Offertory Hymns
0 0

More lyrics you may want