Full Lyrics
REFRAIN
Anyị g'eje n'ihu Chineke nye Ya ekele,
Ony'obi ọma nke Ya n'enweghị ube,
Anyị g'eji Aja nke Missa too Ya wee rịọ kwa Ya mgbaghara njọ.
VERSE 1
Anyị g'eje n'ihu Chineke Onye Ker'ụwa nile,
Anyị g'eje gbuoro ya ikpere kpeisiala nye Ya.
VERSE 2
Anyị g'eje n'ihu Chineke Onye Ker'akụnụba nile.
VERSE 3
Anyị g'eje n'ihu Chineke Onye Kere ụwa chọọ ya mma.
VERSE 4
Anyị g'eje n'ihu Chineke Onye Kere mmadụ, nye ya uche, nye ya akọ nye kwa ya ọgụgụ isi.
VERSE 5
Anyị g'eje n'ihu Chineke Onye Kere ụwa chọọ ya mma nye ya mmadụ.