Full Lyrics
CHORUS
Anyị g'eje n'ihu Chineke nye Y'ekele,
Ony'obi ọma nke Ya n'enweghị ube.
Anyị g'eji nnukwu Aja nke Missa too Ya,
Wee rịọ kwa Ya mgbaghara njọ.
VERSE 1
Anyị g'eje n'ihu Chineke onye ker'ụwa niile.
REFRAIN
Anyị g'eje gbuoro Ya ikpere, kpọ isiala nye Ya.
VERSE 2
Anyị g'eje n'ihu Chineke onye ker'akụ n'ụba nile.
VERSE 3
Anyị g'eje n'ihu Chineke onye kere ụwa chọ ya mma.
VERSE 4
Anyị g'eje n'ihu Chineke onye kere mmadụ, nye ya uche,
Nye ya akọ, nye kwa ya ọgụgụ isi.
VERSE 5
Anyị g'eje n'ihu Chineke onye kere ụwa chọ ya mma nye ya mmadụ.