Full Lyrics
INTRO
Anyị ehunyere Gị o!
O Chineke Nna, aja anyị, aja obiọma anyị naebutere Gị!
Doonụ ya nsọ.
REFRAIN
Nara ya gozie ya,
Ezi Chineke gbanwoo ya
dị k'aj' Ebel.
VERSE 1
Etu mgb'isi ọma si agbago n'ọlta gị dielu,
Dinwenu mee k'aj'anyị rute gị aka.
VERSE 2
O! Nna aja nke a ụmụ gị naachụ
bụ ofu aj'ahụ Nwa gị chụrụ n'obe.
Biko anyị n'ehunye ya maka ndị dị ndụ
na ndị nile nwụr'anwụ.
VERSE 3
Olisa doo nara n'aj'ekele,
Ọkụ n'eria aja nara n'aj' otito.
Achịcha si n'ihe ala mịtara
na mmanya si na vaịn k'anyị n'enye gị,
naranụ ha gozie.