Ezi Chukwu Nara Aja Anyi by Eze G. Dan Shy — Lyrics

Eze G. Dan Shy Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Anyị arịọ gị, naza aja anyị, msi n'ime nata aja anyị. Ezi Chukwu, Ezi Chukwu, nabata ya, were ya, gọzie ya, mekwaa ya, Nna k'ọ dị mma. VERSE 1 Mgbe anyị naechetere gị aja obi ọma anyị, nke bụ ihe ala mịpụtara, ọ bụ gịnị nkwụghachi ịhụnanya gị, anyị enweghị ike ya. VERSE 2 Mgbe igwe anyị bụ ụmụ gị, gbakọrọ n'ihu gị ịchụrụ gị aja kachasị nsọ, ka anyị nyeranye ya maka ndụ mmadụ niile, ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. VERSE 3 Sọ ngị bụ ọdụ ndị kwere na gị, ndụ ihe niile n'ụwa ma n'eligwe. Gosi anyị ụzọ nke ka mma ije, wee yọọ sị gị nụrụ arịrịọ anyị na gị. VERSE 4 Ndị nsọ naeju kwa anụrị, eto afa ọma gị naeto kwa ike gị. Kwere k'anyị soro ha too gị, oge niile site n'aja anyị. VERSE 5 Gọzie anyị, gọzie anyị, gọzie, O Chukwu anyị, ndị nọ naachụrụ gị aja. Nata anyị, nara anyị, naza arịrịọ Chukwu anyị, aja nke ụmụ anyị.

Download the sheet music

Ezi Chukwu Nara Aja Anyi

Ezi Chukwu Nara Aja Anyi

By Eze G. Dan Shy
Solfa
Igbo
2 pages
6 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want