Full Lyrics
[CHORUS]
Anyị abịawo ịbunye Gị onyinye
Anyị abịawo ịchụrụ Gị aja dị nsọ
Anyị n'ayọzi Gị ka Ị nara onyinye anyị
Dịka aja Abel biko Chukwu
Anyị n'ayọzi Gị ka
[VERSE 1]
Ị nara aja anyị dịka nke Abel biko Chukwu
Dịka ndị nsọ niile bụ ndị bunyere Gị onyinye dị Gị mma
Anyị abịawo ịbunye Gị onyinye
Dịka Melkizedek bụ onye chụụrụ Gị aja masịrị Gị
Anyị abịawo ịchụrụ Gị aja dị nsọ
[VERSE 2]
Nna anyị abịawo ịbunye Gị onyinye
Onyinye I nyere anyị ka anyị ji wee bịa
Anyị abịawo ịbunye Gị onyinye
[VERSE 3]
Oh Dinwenụm anyị n'ayọzi Gị
Ka I gọzie onyinye anyị ma gọzie anyị
Oh Dinwenụm anyị n'ayọzi Gị
Ka I gọzie aja anyị ma gọzie anyị