Full Lyrics
CHORUS
Anyị abịawo Chukwu anyị abịawo
Kpọọ isiala nye Gị Nna Onye nwe m
Anyị bịara n'obi Gị Eze r'ib'otito
VERSE I
Anyị bịara n'ihu Gị
K'anyị bulie aha Gị elu
Eze ebube Onye dị nsọ
Nna nara ekele
VERSE II
Chineke, anyị abịala
K'anyị chụọ aja dị nsọ
Anyị bịara k'anyị kpọọrọ Gị isiala
N'obi Gị nke dị nsọ
VERSE III
Anyị bịara n'obi Gị
K'anyị nara ngozi nke si n'igwe ebube
Si n'igwe amara si n'igwe
Wụsa n'ụwa anyị o Papa