Full Lyrics
CHORUS
Anyị abịago n'iru Chineke Nna
K'anyị kpọọ isi ala nye ya
Kelee ya
Chineke ụmụ gị abịago.
Nna gbata ọsọ bịanụ zaa n'anyị o
Nna gbata ọsọ bịanụ zaa n'anyị o.
VERSE 1
Ekene dịrị Gị Chineke
Otito dịrị aha nsọ Gị
Mgbe nile
Onye n'azọpụta ụmụ ya
Mgbe ha kpọrọ ya
N'edu ha n'echekwaba ha.
VERSE 2
Dinwenu Chineke bịa
Gbaghara anyị njọ anyị nile
Melebere Chineke doo
Nna ndụ anyị
Nna gbata ọsọ bịanụ zaa n'anyị o.
VERSE 3
Chineke anyị n'achụrụ Gị aja missa
Ị bụ Chukwu anyị o
Sọsọ Gị k'anyị n'achọ
Sọsọ Gị k'anyị n'achọ.