Full Lyrics
CHORUS
Aku amaka, nwanne m
Aku amaka, uba amaka
Nwanne m, onye Chineke gọziri ya chet' ogbenye doo
Ndị Chineke gọziri ha chet' ogbenye doo
VERSE 1
Onye Chineke gọziri n'ụwa ya sị Chukwu daalụ
Afọma Chukwu ebuka biko, bịa kele Chukwu
VERSE 2
I chezọgọ n'ụwa hiara gị ahụ mgbe ị dịka nwa ogbenye
Ọgaranya chezọgọ na agụụ gụrụ gị n'ezie, ụwa vaghagha
VERSE 3
Chetakwa na Chineke naahụ gị n'obi
Gosi ụmụ ogbenye chetakwa na Chineke gaagọzi gị ezi Nna
SOPRANO SOLO
Aku abata nwanne m, i wee chezọ Chukwu
Onye kọrọ gị? Ọkwa Chineke Nna bụ ya nyere gị akụ n'ụba
Ọkwa Chineke Nna bụ ya gaanara gị ya m'ọ chọọ