Aja Werewere Nye Nwaodibo Gi by Nworie Collins Ifejika — Lyrics

Nworie Collins Ifejika Igbo Burial / Funeral Hymns Offertory Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Nara aja anyi naachu Chineke, n'isi nwaodibo Gi; ka o nata ebere na ihe nke ihu Gi n'uju. Meenu ka aja anyi naachunyere Gi buuru ya aja werewere, dika o naabia izute Gi n'obi Gi. dika o naabiakwute Gi Chukwu. VERSE 1 Dika Judasi si wee chunyere Gi aja maka ndi ya dara n'ogu, etu ahu ka anyi si achunyere Gi aja n'isi nwaodibo Gi. Biko nabata ya n'ala eze Gi di otito. VERSE 2 O nweghi onye gaakwudonwu n'ihu Gi Chineke, ma o buru na I gbakoba njo anyi ga. Biko ka aja a dika aja Christi churu n'elu obe wee medaa Gi obi maka njo ya na njo anyi ga. VERSE 3 Dika ndi mu'ozi si ebutere Gi aja anyi Chineke, ka ha si etu ahu duruo nwaodibo Gi n'ihu oche eze Gi. Nabata ya biko, ma chekwaba mkpuru obi ya; kasie ya obi site n'inye ya ezumike ebebe.

Download the sheet music

Aja Werewere Nye Nwaodibo Gi

Aja Werewere Nye Nwaodibo Gi

By Nworie Collins Ifejika
Staff & Solfa
Igbo
5 pages
1 Downloads
Burial / Funeral Hymns Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want