Full Lyrics
CHORUS
Aja nke elu obe n'aja nke altar b'otu ihe
Maka n'ọ bụ Kristi n'onwe ya
Bụ onye nchụaja bụrụkwa ih'e ji achụ ya
REFRAIN I
N'elu obe Ọ n'agba mmee
Man'ugbu a n'altar dị ngọzi site n'igb'uko nd'ụkọchukwu
REFRAIN II
Ọ naghị agbazi mmee
VERSE 1
N'oriri Ikpeazụ ka Kristi dobere
Eucharistia dị asọ
Na ya ka O nyere iwu a
"Mebenu nke a na ncheta nke m o"
VERSE 2
Lee nụ Onyenweanyi n'altar
Ụkọchukwu ezie
Anyị kwenyere n'ezie
Na Ọ bụ ụzọ nzọpụt'anyị
VERSE 3
K'anyị sonye Kristi n'aja nke Missa
Ọ bụ aja kasị nsọ
N'ihi n'Ọ bụ ụzọ
Anyị g'esi zute Nna n'enigwe
VERSE 4
Leenụ Chukwu Nwa ka Ọ si gbasa
Aka ya n'obe
Eh Ọ n'asị ndị njọ
Bịa naranụ ndụ olepu
SOLO CHANT
Ih'omimi dị nsọ dị elu
Dị n'igb'uko nd'ụkọchukwu
Achịcha na mmanya k'an'erugharị
N'og'o dị do nsọ
Site n'ak'ụkọchukwu
Onye nọchiri anya Dinwenu anyị
N'ichunyere Chukwu aja dị okpu
Nk'anaghị agbazi mme
Ọ naghị agbazi mmee
Ọ naghị agbazim mee