AHUHU JESU ! by Chidi Zeigwe — Lyrics

Chidi Zeigwe Igbo Lenten Hymns Holy Week Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Onyenweanyi nwụrụ n'elu obe, Dinwenụ nwụrụ n'elu obe. Maka mk'o jiri bịa n'ụwa, Maka mk'o jizite nwa ya. Ọ dịghị ihe o mere n'eziokwu, E jiri kpọgbuo ya n'obe. Dinwenụ gbaghara, Dinwenụ gbaghara. VERSE 1 Ndị agha kpụụrụ ya Pịlet, Pịlet ama onyenwem ikpe ọnwụ. Ha wee kpụrụ onye aka ya dị ọcha, Pịawa ya ụtarị, pịarụcha ya ahụ. Gwanụm ihe o mere lee, Gwanụm ihe o mere lee. Dinwenụ gbaghara, Dinwenụ gbaghara. VERSE 2 Ndị agha kpara okpu ogwu, Kudo n'isi Jesu. Ha bido kparịba ya, Kọchaba ya wee mer'ihe ọchị. Ha buru ya asọ n'ihu, Ehomandi ezure o. Dinwenụ gbaghara, Dinwenụ gbaghara. VERSE 3 Onye nwe anyị tara ahụhụ, Daa ugboro atọ n'ugwu bụ sọ okwute. Agba ray'ọtọ n'ihu igwe mmadụ, Ọkwan'ezemo. Dinwenụ gbaghara, Dinwenụ gbaghara. VERSE 4 Ndị agha kụrụ ya ntu, Kpọdọ ya n'obe n'etiti ndị ohi. Jesu anwụọ, akwa mgbochi ekewa o, Akwa mgbochi ekewa o. Dinwenụ gbaghara, Dinwenụ gbaghara.

Download the sheet music

AHUHU JESU !

AHUHU JESU !

By Chidi Zeigwe
Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Lenten Hymns Holy Week Hymns
0 0

More lyrics you may want