Full Lyrics
REFRAIN
Chukwu lee m na be gị o,
Onyeọma a biara m i nye gị ekele,
Ma nara ngọzi.
VERSE 1
Ekele ọma kam g'enye n'ime ụlọ nsọ Chukwu,
Otito ọma kam g'enye gị,
Maka n'ọ bụ gị ker' anyị, kele nụ ya.
VERSE 2
Bata nụ k'anyị kpọọ isiala nye ya,
Maka n'ọ naemere gị ọma,
K'anyị gbuo ikpere n'ihu ya,
Were nara mma ya, kele nụ ya.
VERSE 3
Ma kedu onye nwere ike ịbịa,
Were nata mma n'ihu Chukwu?
Ọ bụ onye dị umeala,
Na onye nwere obi ọcha, kele nụ ya.