Full Lyrics
[REFRAIN]
Ihe ọbụla ị chọrọ kam g'eme,
Ebe ọbụna ị chọrọ kam g'eje,
Ife bu mmasị Gị Chi mu o ya ka mg'eme,
Ihe b'uche Gị Chi mu o g'ab'uche mo.
Lee mo abịaram im'uche Gị.
[VERSE 1]
Edeela ya n'ime akwụkwọ sị n'ọbụm gem'uche Gị,
Oo ya n'amasị m Chi moo, m g'em'uche Gị,
Iwu Gị nile dị n'ime ime obi mo.
[VERSE 2]
Aja n'ihe onyinye ha anaghị asọ Gị,
Ha anaghị asọ Gị.
I megheela ntị moo, I megheela obi mo,
N'Ị chọghị aja nsuroku, n'Ị chọghị aja njọ,
Ngwa nụ lee m abịaram im'uche Gị.
[VERSE 3]
Ekwuputala m eziokwu Gị n'ime ụlọ nsọ,
Emechighịm ọnụm, Dinwenum Ị ma nkea.
[VERSE 4]
Ezoghim ịdị mma Ị n'ime ime obim mo,
Eziokwu na nzọpụta Gị ezielam ha,
Dinwenum, Ị ma nkea.