Full Lyrics
[OTITO DIRI CHINEKE I]
INTRO
Otito dịrị Chineke n'elu kach'elu;
N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ ndị nwere obi ọma.
REFRAIN
O tito dịrị Chukwu
O tito dịrị Chukwu
n'elu kasị elu
VERSE 1
Anyị ajaa gị mma eh
Anyị agọzie gị eh
Anyị esekpuoro gị
Anyị etoo gị
Anyị ekelee gị n'ihi nnukwu ebube gị
Oseburụwa Chukwu Eze nke eluigwe
Chukwu Nna ji ike nile.
Otito dịrị gị n'elu kasị elu.
VERSE 2
Dinwenu Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ
Dinwenu Chukwu Nwa nke Nna
Gị onye naekpochapụ njọ nk'ụwa, meer'anyị ebere
Gị onye naekpochapụ njọ nk'ụwa, nar'arịrịọ anyị
Gị onye nọ n'aka nri Nna, meer'anyị ebere
Otito dịrị gị n'elu kasị elu.
VERSE 3
N'ihi na sọ gị dị Nsọ, sọ gị bụ Dinwenu,
sọ gị Jesu Kristi, kachasị dị elu
Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna. Amen, Amen!
Otito dịrị gị n'elu kasị elu.
[ONYENWEANYI MEE EBERE]
Oh Onyenweanyị metar'anyị ebere
O Onyenweanyị mer'anyị ebere, meere anyị ebere
Kristi mer'anyị ebere, mee ebere
Oh Kristi biko meere anyị ebere
O Kristi biko meere anyị ebere
Meere anyị ebere.