Full Lyrics
OTITO DIRI CHINEKE (NEW IGBO GLORIA)
INTRO
Otito diri Chineke n'elu kach'elu;
N'uwa udo udo diri ndi mmadu nwere obi oma.
REFRAIN
Otito diri Chukwu
Otito diri Chukwu n'elu kasi elu.
VERSE 1
Anyi ajaa Gi mma eh
Anyi ekpuoro Gi
Anyi etoo Gi
Anyi ekelee Gi n'ihi nnukwu ebube Gi
Oseburuwa Chukwu
Eze nke eluigwe
Chukwu Nna ji ike nile.
Otito diri Gi n'elu kasi elu.
VERSE 2
Dinwenu Jesu Kristi,
so otu Nwa Chineke muru
Dinwenu Chukwu nwaturu nke Chineke
Nwa nke Nna
Gi Onye naekpochapu njo nk'uwa meer'anyi ebere
Gi Onye naekpochapu njo nk'uwa nur'aririo anyi
Gi Onye no n'aka nri Nna meer'anyi ebere
Otito diri Gi n'elu kasi elu.
VERSE 3
N'ihi na so Gi di Nso,
so Gi bu Dinwenu,
so Gi Jesu Kristi,
kachasi di elu
Gi na Muo Nso n'ebube Chukwu Nna
Amen, Amen!
Otito diri Gi n'elu kasi elu.
ONYENWEANYI MEE EBERE
Oh Onyenweanyi mere,
O Onyenweanyi mee r'anyi ebere.
Biko meer'anyi ebere,
Biko meere anyi ebere,
Meere anyi ebere.
Kristi mere,
Oh r'anyi ebere, mee ebere.
Kristi biko meer'anyi ebere,
O Kristi biko meere anyi ebere,
Meere anyi ebere.