OTITO DIRI CHINEKE by Fr. Bart C. Ezeokafor — Lyrics

Fr. Bart C. Ezeokafor Igbo Gloria Penitential Rite / Kyrie Mass Settings Solfa notation

Full Lyrics

[OTITO DIRI CHINEKE] [CHORUS] Otito diri Chineke n'elu kach'elu; N'uwa udo udo diri ndi mmadu nwere obi oma. [VERSE 1] Anyi ajaa Gi mma eh Anyi esekpuoro Gi Anyi etoo Gi Anyi ekelee Gi n'ihi nnukwu ebube Gi Oseburuwa Chukwu Eze nke eluigwe Chukwu Nna ji ike nile. [VERSE 2] Dinwenu Jesu Kristi, so otu Nwa Chineke muru Dinwenu Chukwu nwaturu nke Chineke Nwa nke Nna Gi Onye naekpochapu njo nk'uwa meer'anyi ebere Gi Onye naekpochapu njo nk'uwa nur'aririo anyi Gi Onye no n'aka nri Nna meer'anyi ebere. [VERSE 3] N'ihi na so Gi di Nso, so Gi bu Dinwenu, so Gi Jesu Kristi, kachasi di elu Gi na Muo Nso n'ebube Chukwu Nna Amen, Amen! Otito diri Gi n'elu kasi elu. [ONYENWEANYI MEE EBERE] Oh Onyenweanyi mee r'anyi ebere, O Onyenweanyi biko mee r'anyi ebere, mee r'anyi ebere. Kristi mee r'anyi ebere, Oh Kristi biko mee r'anyi ebere, mee r'anyi ebere. Oh Onyenweanyi mee r'anyi ebere, O Onyenweanyi biko mee r'anyi ebere, mee r'anyi ebere.

Download the sheet music

OTITO DIRI CHINEKE

OTITO DIRI CHINEKE

By Fr. Bart C. Ezeokafor
Solfa
Igbo
2 pages
6 Downloads
Gloria Penitential Rite / Kyrie Mass Settings
0 0

More lyrics you may want