Full Lyrics
[OTITO DIRI CHINEKE]
[CHORUS]
Otito diri Chineke n'elu kach'elu;
N'uwa udo udo diri ndi mmadu nwere obi oma.
[VERSE 1]
Anyi ajaa Gi mma eh
Anyi esekpuoro Gi
Anyi etoo Gi
Anyi ekelee Gi n'ihi nnukwu ebube Gi
Oseburuwa Chukwu
Eze nke eluigwe
Chukwu Nna ji ike nile.
[VERSE 2]
Dinwenu Jesu Kristi,
so otu Nwa Chineke muru
Dinwenu Chukwu nwaturu nke Chineke
Nwa nke Nna
Gi Onye naekpochapu njo nk'uwa meer'anyi ebere
Gi Onye naekpochapu njo nk'uwa nur'aririo anyi
Gi Onye no n'aka nri Nna meer'anyi ebere.
[VERSE 3]
N'ihi na so Gi di Nso,
so Gi bu Dinwenu,
so Gi Jesu Kristi,
kachasi di elu
Gi na Muo Nso n'ebube Chukwu Nna
Amen, Amen!
Otito diri Gi n'elu kasi elu.
[ONYENWEANYI MEE EBERE]
Oh Onyenweanyi mee r'anyi ebere,
O Onyenweanyi biko mee r'anyi ebere,
mee r'anyi ebere.
Kristi mee r'anyi ebere,
Oh Kristi biko mee r'anyi ebere,
mee r'anyi ebere.
Oh Onyenweanyi mee r'anyi ebere,
O Onyenweanyi biko mee r'anyi ebere,
mee r'anyi ebere.