Full Lyrics
CHORUS
Ịmara na ọnwụ b'ụzọ ndụ eh
Ọnwụ b'ụzọ ndụ
Ọnwụ b'ụzọ ndụ ebighị ebi
Ọnwụ b'ụzọ ndụ ebighị ebi.
TENOR
Ọ gbawo go, ọ nọghịzi n'ihu juanya, ọ gbawo go.
BASS
Ọ bụzi mmụọ, ọ bụzi mmụọ, ọ gbawo go.
SOPRANO 1
Anam ikpe adịghịrị onye ezi omume,
Onye nwụrụ na Kristi,
Onye chekwubere n'okwu nke Dinwenu,
Onye b'ụzọ nzọpụta anyị.
SOPRANO 2
Ebezi na nwanne m, ebezi na ezi enyi,
Ebezi na, na ọnwụ b'ụzọ ndụ
N'ime onye ahụ nwụrụ na Chukwu.
UNISON
Gị bụ onye dị ndụ, jụọkene onwe gị ajụjụ,
Lee n'onwe gị anya.
TUTTI
Ịmara ndụ ị nebi.
REFRAIN
Jụọ onwe gị ajụjụ,
Mmadụ g'anwụ anwụ,
Ụwa abụghị ebe obibi.
Igwe bụ ụlọ ndị ezi omume.
Ọkụ mmụọ bụ ụlọ ndị ajọ omume.
A g'akọ akụkọ ọma maka gị ọ?
A g'akọ akụkọ ọjọọ maka gị ọ?
Mara na ọnwụ b'ụzọ ndụ ebighị ebi
Maka onye bụ onye ezi omume.