Abụ Ọma Na Azịza {Good Friday} by Chidi Ezigwe — Lyrics

Chidi Ezigwe Igbo Lenten Hymns Responsorial Psalms Holy Week Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Nna n'aka gị, Nna n'aka gị, Nna n'aka gị ka m tinyere mkpụrụ obi m. VERSE 1 Dinwenu gị ka m gbakụtere, Ekwela ka ihere mee m. Wer' ikpe nkwụmọtọ gị gbaghara m, n'aka gị ka m tinyere mkpụrụ obi m, Dinwenu ọbụ gị ga'zọpụta m. VERSE 2 N'ihu ndị irom nile abụm ih' ihere, ihe ana'mụ amụ n'aka ndị agbata obi m, ihe ana'tụ egwu n'aka ndị oyi m. VERSE 3 Ndị nile hụrụ m n'ụzọ naagbanarị m, Adịm dịka onye nwụr' anwụ ndị mmadụ chezọr' echezọ dịka ihe atụfur' atụfu. VERSE 4 Mana mụnwa, enwerem ntụkwasị obi na Dinwenu, ekwurum sị gị bụ Chukwu m. Ndụ m dị n'aka gị, zọpụta m n'aka ndị kpọrọ m asị. VERSE 5 Ihu sọọ gị amụ n'ebe nwodibo gị nọ, zọpụta m site n'ihunanya gị. Kwasie ike nwee ntasi obi, unu nile nwere okwukwe na Chukwu.

Download the sheet music

Abụ Ọma Na Azịza {Good Friday}

Abụ Ọma Na Azịza {Good Friday}

By Chidi Ezigwe
Solfa
Igbo
1 page
6 Downloads
Lenten Hymns Responsorial Psalms Holy Week Hymns
0 0

More lyrics you may want