Full Lyrics
REFRAIN
Nna m o, n'aka Gị,
Ka m tinye mmụọ m o.
VERSE 1
Dinwenu a ka m gbabere
Ebe a ka ihere mee m o
N'ihi nke eziokwu mpo Gị
Zbaghara m o
Ka m tinyere mkpụrụ obi m o
Ọ bụ Gị gaazọpụta m.
VERSE 2
N'ihi ndị iro m nile a bụ m ihe ihere
Ihe a naakọ n'aka ndị agbataobi m o
Ihe a naatụ egwu n'aka ndị ọmalụ m o
Ihe a naagba ọsọ n'aka ndị ọzọ m.
VERSE 3
Ndị nile hụrụ m n'ụzọ n'agbanarị m
Adị m dịka onye nwụrụ anwụ
Ndị mmadụ chezọrọ echezọ
Dịka ihe a tụfuru atụfu.
VERSE 4
Mana mụnwa etikwuru m Gị Dinwenu
Naasị na ị bụ Chi m
Ekwere m sị ọ bụ n'aka Gị ka oge m nile dị
Zọpụta mụ n'aka ndị iro m
N'aka ndị n'akpagbu m.
VERSE 5
Ihu sọọ Gị amụ n'ebe nwa odibo Gị nọ
Site n'ihụnanya Gị zọpụta mụ
Ka m sie ike nwee ntachi obi
Ụmụ nile nke Dinwenu n'atụ anya.