Full Lyrics
PART 1: ELOI LAMASABATANI
VERSE 1
Lee k'uwa si mar'ihe
Ha wee nara Barabas n'ọnọdụ ya
Onye naarụrụ m mma, dị ihe ya n'ike
Ha ji gaa kpagbuo Onye nwem
REFRAIN
Eloi Lama Sabatani, Sabatani
Eloi Lama Sabatani
VERSE 2
Ndị Juu buru ya sọ mmiri
Ha kpuru ya okpu ogwu n'isi
Welu ube ha ji maa ya n'akụkụ
O tie mkpu sị, Onye nwem
VERSE 3
Ọkpara Chineke wee nwụọ ọnwụ n'ike
Eze ndị eze wee nwụọ ọnwụ n'ike
Ọkpara Chineke wee nwụọ ọnwụ n'ike
O tie mkpu sị, Ọ gwụwọ
PART 2: AKWA JESO N'ELU OBE
VERSE 1
Gee ntị akwa Jeso kwara n'elu obe
Gee ntị akwa Jeso kwara n'elu obe
REFRAIN
Ewo! Ọ gwụwọ, Ọ gwụwọ, Ọ gwụwọ, Ọ gwụwọ.
VERSE 2
Ya mee mgbe Jeso hụrụ nne ya
Nne lee nwa gị, Nwa lee nne gị
VERSE 3
Nna gịnị mere ijiri hapụm n'ebea
VERSE 4
Nna akpịrịm naakpọm nkụ