Igaghi Anwu Ozo by Joseph Onuorah — Lyrics

Joseph Onuorah Igbo Burial / Funeral Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Ọnwụ egbugo nwanne m, nwanne m nke hụrụ n'anya. Ọnwụ emejọkọ ya n'ebi nọ, nwanne m gawazie gaa zulu ike. Gaa zulu ike na be Nna gị, n'ị gaghị anwụ ọzọ nwanne m. VERSE 1 (SOPRANO) Nwanne m ndo, iwe dajuo gị n'obi. N'ọnwụ egbugo gị o, gaa zulu ike. Gaa zulu ike n'ị gaghị anwụ ọzọ. MALE VOICE Ihe ị ka bu n'obi ị gaeme n'elu ụwa ehika. Mana hapụbazie ya, hapụbazie ya nwanne m. Gaa zulu ike n'ị gaghị anwụ ọzọ. VERSE 2 (SOPRANO) Ndọlị gị niile n'elu ụwa abịago na njedebe. Ahụhụ gị n'elu ụwa akwụsịgo, jebezie gaa zulu ike. Gaa zulu ike n'ị gaghị anwụ ọzọ. MALE VOICE Ọnwụ, ọnwụ, o nwere ihe ị chọrọ n'aka nwanne m ọzọ? Ọ kwa ị mezugo ihe ị chọrọ? Ị gbugo nwanne m, ezi nwanne m nke hụrụ n'anya. Ọnwụ egbugo gị o, dibazianụ gaa zulu ike. Ị gaghị anwụ ọzọ. Ọnwụ ị chere n'ị gbu nwanne m egbu, ị maghị n'ị naebunye ya n'ụlọ ndo kwa. Ọnwụ emego ike ya n'ebe nọ nwanne m. Gaa zulu ike n'ị gaghị anwụ ọzọ.

Download the sheet music

Igaghi Anwu Ozo

Igaghi Anwu Ozo

By Joseph Onuorah
Solfa
Igbo
1 page
4 Downloads
Burial / Funeral Hymns
0 0

More lyrics you may want