HA ADIROZI NKEWA. by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Wedding Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Chineke, Onyenw'anyi, ejikogo mmadu abuo ndi a, ka ha buru ofu. M'odi nma, m'odi njo, h'adirozi nkewa. h'adirozi nkewa. H'adirozi nkewa. H'adirozi nkewa. VERSE 1 Na mbu, oge Chineke kechara nwoke mbu, kee nwanyi mbu, O gwara ha si, "Mubaa, juputa ebe nile". VERSE 2 Ya mere, (Name) Hukwa di gi n'anya! (Name) Jeere ya ozi! (Name) Rubere ya isi! Mgbe nile nime ndu gi! VERSE 3 Ya mere (Name) Hukwa nwunye gi n'anya! (Name) Legide ya anya! (Name) Sopuru ya! Mgbe nile nime ndu gi! VERSE 4 Ndi asiri g'abia, n'ezie, ndi nkwuto g'abia, ndi ndumodu g'abia. Mana Chineke gwar'anyi n'ime akwukwo nso Ya, s'ihe Chukwu jikoro, mmadu atosala ya! VERSE 5 Udo nke Chineke n'enye. Ekper'anyi mgbe nile b'udo! Udo nke Chineke n'enye. Unu n'alu olu, udo! Udo nke Chineke n'enye. Unu n'azu ahia, udo! Udo nke Chineke n'enye. Unu no n'ulo, udo! Udo nke Chineke n'enye. Unu no n'ije, udo! Udo nke Chineke n'enye. Mana ndu man'onwu, udo! Udo nke Chineke n'enye. Udo nke Chineke n'enye. Udo nke Chineke n'enye. Udo nke Chineke n'enye.

Download the sheet music

HA ADIROZI NKEWA.

HA ADIROZI NKEWA.

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
9 pages
2 Downloads
Wedding Hymns
0 0

More lyrics you may want