Full Lyrics
REFRAIN
Ebere n'uju nke mgbapụta dị n'aka Osebruwa.
VERSE 1
N'ugbu mmiri kam n'akpọku gị O Osebruwa.
Osebruwa nụr' akwa m nyem aka m n'ebe gee ntị n'arịrịọ m.
VERSE 2
Ọbụrụ na gị Osebruwa na agụ ajọọ omume anyị ọnụ,
Dinwenu Onye, Onye g'eguzo?
Mana ị n'agbaghar'anyị, n'ihi nke a, anyị n'asọpụrụ gị.
VERSE 3
Mkpụrụobi m n'eche Osebruwa na nkwa ya kam nwere nchekwube.
Mkpụrụobi m n'ache Dinwenu karịa otu ndị nche si eche chi ọbụbọ
Ka Onye nche n'atụ anya chi ọbụbọ Ka Izreal n'atụ anya Osebruwa.
VERSE 4
N'ihi na ebere n'uju nke mgbapụta dị n'aka Osebruwa
Eziokwu Ọ gaagbapụta Izreal, gbapụt' Izrel n'ajọ omume ya nile.